Diuteronomi 29:17
Deuteronomy 29:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ.
Deuteronomy 29:17 in English
Deuteronomy 29:17 · Berean Standard Bible
You saw the abominations and idols among them made of wood and stone, of silver and gold.
Context
15ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a. 16Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ. 17Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ. 18Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu. 19Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.