Native Bible

Deuteronomy 29:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.

Deuteronomy 29:16 in English

Deuteronomy 29:16 · Berean Standard Bible

For you yourselves know how we lived in the land of Egypt and how we passed through the nations on the way here.

Context

14Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu, 15ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a. 16Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ. 17Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ. 18Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.