Diuteronomi 28:5
Deuteronomy 28:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.
Deuteronomy 28:5 in English
Deuteronomy 28:5 · Berean Standard Bible
Your basket and kneading bowl will be blessed.
Context
3Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi. 4Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị. 5Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ. 6Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ. 7Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.