Diuteronomi 28:26
Deuteronomy 28:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
Deuteronomy 28:26 in English
Deuteronomy 28:26 · Berean Standard Bible
Your corpses will be food for all the birds of the air and beasts of the earth, with no one to scare them away.
Context
24Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi. 25Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị. 26Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha. 27Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha. 28Onyenwe anyị ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.