Native Bible

Deuteronomy 28:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.

Deuteronomy 28:14 in English

Deuteronomy 28:14 · Berean Standard Bible

Do not turn aside to the right or to the left from any of the words I command you today, and do not go after other gods to serve them.

Context

12Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. 13Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru. 14Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe. 15Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị. 16Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.