Diuteronomi 28:13
Deuteronomy 28:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.
Deuteronomy 28:13 in English
Deuteronomy 28:13 · Berean Standard Bible
The LORD will make you the head and not the tail; you will only move upward and never downward, if you hear and carefully follow the commandments of the LORD your God, which I am giving you today.
Context
11*Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị. 12Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. 13Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru. 14Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe. 15Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.