Native Bible

Deuteronomy 27:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Deuteronomy 27:19 in English

Deuteronomy 27:19 · Berean Standard Bible

‘Cursed is he who withholds justice from the foreigner, the fatherless, or the widow.’ And let all the people say, ‘Amen!’

Context

17“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 18“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 19“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 20“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 21“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.