Diuteronomi 26:3
Deuteronomy 26:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.”
Deuteronomy 26:3 in English
Deuteronomy 26:3 · Berean Standard Bible
to the priest who is serving at that time, and say to him, “I declare today to the LORD your God that I have entered the land that the LORD swore to our fathers to give us.”
Context
1Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya, 2ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya. 3Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.” 4Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị. 5Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ.* Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.