Native Bible

Deuteronomy 26:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha.

Deuteronomy 26:16 in English

Deuteronomy 26:16 · Berean Standard Bible

The LORD your God commands you this day to follow these statutes and ordinances. You must be careful to follow them with all your heart and with all your soul.

Context

14Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu. 15Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.” 16Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha. 17I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee. 18Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.