Diuteronomi 25:7
Deuteronomy 25:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼIzrel. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.”
Deuteronomy 25:7 in English
Deuteronomy 25:7 · Berean Standard Bible
But if the man does not want to marry his brother’s widow, she is to go to the elders at the city gate and say, “My husband’s brother refuses to preserve his brother’s name in Israel. He is not willing to perform the duty of a brother-in-law for me.”
Context
5Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa. 6Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel. 7Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼIzrel. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.” 8Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,” 9nwanyị ahụ ga-ejekwuru ya nʼihu ndị okenye, tọpụ akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ aka nri ya, bụọ ya asụ nʼihu, sị ya, “Otu a ka a na-eme nwoke ọbụla jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya nwoke.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.