Native Bible

Deuteronomy 25:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ehi* na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.

Deuteronomy 25:4 in English

Deuteronomy 25:4 · Berean Standard Bible

Do not muzzle an ox while it is treading out the grain.*

Context

2Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya, 3ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya. 4Mgbe ehi* na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ. 5Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa. 6Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.