Native Bible

Deuteronomy 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.

Deuteronomy 22:10 in English

Deuteronomy 22:10 · Berean Standard Bible

Do not plow with an ox and a donkey yoked together.

Context

8*Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara. 9Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ. 10Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi. 11Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa. 12Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.