Diuteronomi 20:6
Deuteronomy 20:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!
Deuteronomy 20:6 in English
Deuteronomy 20:6 · Berean Standard Bible
Has any man planted a vineyard and not begun to enjoy its fruit? Let him return home, or he may die in battle and another man enjoy its fruit.
Context
4Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.” 5Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị! 6Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya! 7Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.” 8Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ahụ ga-ekwukwa sị, “Ọ dị onye egwu na-atụ? Ọ bụrụ na o nwere onye ụjọ na-atụ, ya laghachi nʼụlọ ya ka ịtụ ụjọ ya hapụ ijide ndị ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.