Diuteronomi 20:19
Deuteronomy 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha?
Deuteronomy 20:19 in English
Deuteronomy 20:19 · Berean Standard Bible
When you lay siege to a city for an extended time while fighting against it to capture it, you must not destroy its trees by putting an axe to them, because you can eat their fruit. You must not cut them down. Are the trees of the field human, that you should besiege them?
Context
17Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu. 18Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị. 19Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha? 20Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.