Native Bible

Deuteronomy 20:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị.

Deuteronomy 20:18 in English

Deuteronomy 20:18 · Berean Standard Bible

so that they cannot teach you to do all the detestable things they do for their gods, and so cause you to sin against the LORD your God.

Context

16Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi. 17Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu. 18Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị. 19Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha? 20Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.