Native Bible

Deuteronomy 20:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso.

Deuteronomy 20:15 in English

Deuteronomy 20:15 · Berean Standard Bible

This is how you are to treat all the cities that are far away from you and do not belong to the nations nearby.

Context

13Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị nyefere gị ya nʼaka, were mma agha gbuo nwoke ọbụla nọ nʼime ya. 14Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma. 15Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso. 16Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi. 17Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.