Diuteronomi 20:14
Deuteronomy 20:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma.
Deuteronomy 20:14 in English
Deuteronomy 20:14 · Berean Standard Bible
But the women, children, livestock, and whatever else is in the city—all its spoil—you may take as plunder, and you shall use the spoil of your enemies that the LORD your God gives you.
Context
12Ma ọ bụrụ na ha ekweghị ime udo, lụso gị agha, mgbe ahụ, ndị agha gị ga-agba ya gburugburu. 13Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị nyefere gị ya nʼaka, were mma agha gbuo nwoke ọbụla nọ nʼime ya. 14Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma. 15Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso. 16Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.