Native Bible

Deuteronomy 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”

Deuteronomy 2:9 in English

Deuteronomy 2:9 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to me, “Do not harass the Moabites or provoke them to war, for I will not give you any of their land, because I have given Ar to the descendants of Lot as their possession.”

Context

7Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu. 8Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ,* ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab. 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.” 10(Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak. 11A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.