Diuteronomi 2:7
Deuteronomy 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
Deuteronomy 2:7 in English
Deuteronomy 2:7 · Berean Standard Bible
Indeed, the LORD your God has blessed you in all the work of your hands. He has watched over your journey through this vast wilderness. The LORD your God has been with you these forty years, and you have lacked nothing.
Context
5Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.* 6Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’ ” 7Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu. 8Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ,* ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab. 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.