Native Bible

Deuteronomy 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.

Deuteronomy 2:23 in English

Deuteronomy 2:23 · Berean Standard Bible

And the Avvim, who lived in villages as far as Gaza, were destroyed by the Caphtorites, who came out of Caphtor * and settled in their place.)

Context

21Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha. 22Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa. 23Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza. 24Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu. 25Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.