Native Bible

Deuteronomy 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.

Deuteronomy 2:21 in English

Deuteronomy 2:21 · Berean Standard Bible

They were a people great and many, as tall as the Anakites. But the LORD destroyed them from before the Ammonites, who drove them out and settled in their place,

Context

19Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.” 20* Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum. 21Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha. 22Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa. 23Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.