Native Bible

Deuteronomy 18:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.

Deuteronomy 18:7 in English

Deuteronomy 18:7 · Berean Standard Bible

then he shall serve in the name of the LORD his God like all his fellow Levites who stand there before the LORD.

Context

5Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile. 6Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara, 7ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị. 8Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya. 9Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.