Native Bible

Deuteronomy 18:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile.

Deuteronomy 18:5 in English

Deuteronomy 18:5 · Berean Standard Bible

For the LORD your God has chosen Levi and his sons out of all your tribes to stand and minister in His name for all time.

Context

3Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya. 4Ha ga-enwetakwa mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi unu, ya bụ, ọka mbụ unu, mmanya vaịnị ọhụrụ unu, mmanụ oliv unu na ajị mbụ a kpụchapụtara site nʼahụ igwe atụrụ unu. 5Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile. 6Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara, 7ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.