Native Bible

Deuteronomy 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.

Deuteronomy 18:14 in English

Deuteronomy 18:14 · Berean Standard Bible

Though these nations, which you will dispossess, listen to conjurers and diviners, the LORD your God has not permitted you to do so.

Context

12Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a. 13Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị. 14Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ. 15Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị. 16Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.