Diuteronomi 18:12
Deuteronomy 18:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.
Deuteronomy 18:12 in English
Deuteronomy 18:12 · Berean Standard Bible
For whoever does these things is detestable to the LORD. And because of these detestable things, the LORD your God is driving out the nations before you.
Context
10Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja, 11maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ. 12Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a. 13Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị. 14Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.