Diuteronomi 17:19
Deuteronomy 17:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a.
Deuteronomy 17:19 in English
Deuteronomy 17:19 · Berean Standard Bible
It is to remain with him, and he is to read from it all the days of his life, so that he may learn to fear the LORD his God by carefully observing all the words of this instruction and these statutes.
Context
17Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke. 18Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze. 19Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a. 20Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.