Native Bible

Deuteronomy 17:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”

Deuteronomy 17:16 in English

Deuteronomy 17:16 · Berean Standard Bible

But the king must not acquire many horses for himself or send the people back to Egypt to acquire more horses, for the LORD has said, ‘You are never to go back that way again.’

Context

14Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.” 15O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị. 16Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.” 17Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke. 18Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.