Native Bible

Deuteronomy 17:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”

Deuteronomy 17:14 in English

Deuteronomy 17:14 · Berean Standard Bible

When you enter the land that the LORD your God is giving you and have taken possession of it and settled in it, and you say, “Let us set a king over us like all the nations around us,”

Context

12Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ. 13Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako. 14Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.” 15O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị. 16Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.