Diuteronomi 14:28
Deuteronomy 14:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,
Deuteronomy 14:28 in English
Deuteronomy 14:28 · Berean Standard Bible
At the end of every three years, bring a tenth of all your produce for that year and lay it up within your gates.
Context
26Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ. 27Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị. 28Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị, 29ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.
14:1 Ihe ndị a bụ usoro mmemme iru ụjụ nke ndị na-eme omenaala. Lev 19:27-28
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.