Native Bible

Deuteronomy 12:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche.

Deuteronomy 12:17 in English

Deuteronomy 12:17 · Berean Standard Bible

Within your gates you must not eat the tithe of your grain or new wine or oil, the firstborn of your herds or flocks, any of the offerings that you have vowed to give, or your freewill offerings or special gifts.

Context

15Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya. 16Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri. 17Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche. 18Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara. 19Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.