Native Bible

Deuteronomy 12:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya.

Deuteronomy 12:15 in English

Deuteronomy 12:15 · Berean Standard Bible

But whenever you want, you may slaughter and eat meat within any of your gates, according to the blessing the LORD your God has given you. Both the ceremonially clean and unclean may eat it as they would a gazelle or deer,

Context

13Ị gaghị achụ aja nsure ọkụ gị nʼebe ọbụla masịrị gị, 14ọ bụ naanị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile. 15Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya. 16Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri. 17Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.