Diuteronomi 11:4
Deuteronomy 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu Onyenwe anyị si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi.
Deuteronomy 11:4 in English
Deuteronomy 11:4 · Berean Standard Bible
what He did to the Egyptian army and horses and chariots when He made the waters of the Red Sea * engulf them as they pursued you, and how He destroyed them completely, even to this day;
Context
2Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya, 3ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile. 4Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu Onyenwe anyị si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi. 5Ọ bụghị ụmụ unu hụrụ ihe o meere unu nʼoge ahụ niile unu nọ nʼọzara tutu unu erute nʼebe a, 6na ihe o mere Datan na Abiram, ụmụ Eliab, ndị si nʼebo Ruben, otu ala si meghee ọnụ ya loda ha, ha na ezinaụlọ ha, ụlọ ikwu ha na ihe ọbụla nke dị ndụ ha nwere nʼetiti Izrel niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.