Diuteronomi 11:2
Deuteronomy 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya,
Deuteronomy 11:2 in English
Deuteronomy 11:2 · Berean Standard Bible
Know this day that it is not your children who have known and seen the discipline of the LORD your God: His greatness, His mighty hand, and His outstretched arm;
Context
1Hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, na-edebezukwa ikpe ya na ụkpụrụ ya na ihe niile o nyere nʼiwu. 2Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya, 3ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile. 4Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu Onyenwe anyị si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.