Daniel 9:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị.
Daniel 9:7 in English
Daniel 9:7 · Berean Standard Bible
To You, O Lord, belongs righteousness, but this day we are covered with shame—the men of Judah, the people of Jerusalem, and all Israel near and far, in all the countries to which You have driven us because of our unfaithfulness to You.
Context
5Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ. 6Anyị e geghịkwa ndị ozi gị bụ ndị amụma ntị, bụ ndị gwara ndị eze anyị, na ndị ọchịchị anyị, na nna anyị ha, ma mmadụ niile bi nʼala anyị okwu nʼaha gị. 7“Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị. 8Onyenwe anyị, ihere emegbuola anyị. Ihere dịrị ndị eze anyị, dịkwara ndịisi anyị na ndị nna anyị, nʼihi na anyị emeela mmehie megide gị. 9Ma Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere na mgbaghara niile dịrị, nʼihi na anyị enupurula gị isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.