Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ* mmanụ.

Daniel 9:24 in English

Daniel 9:24 · Berean Standard Bible

Seventy weeks * are decreed for your people and your holy city to stop their transgression, to put an end to sin, to make atonement for iniquity, to bring in everlasting righteousness, to seal up vision and prophecy, and to anoint the Most Holy Place.*

Context

22Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta. 23Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a. 24“Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ* mmanụ. 25“Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu. 26Mgbe izu ụka iri isii na abụọ gasịrị, Onye ahụ e tere mmanụ ka a ga-egbu, ma o nweghị ihe ọ ga-enwe. Usuu agha nke onye ọchịchị ga-abịa bibie obodo na ụlọnsọ. Oge ikpeazụ ga-abịa dịka idee mmiri; agha ga-adịgide ruo nʼoge ọgwụgwụ, e kpebiela na ịla nʼiyi ga-adị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.