Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a.

Daniel 9:23 in English

Daniel 9:23 · Berean Standard Bible

At the beginning of your petitions, an answer went out, and I have come to tell you, for you are highly precious. So consider the message and understand the vision:

Context

21ebe m ka nọ na-ekpere, Gebrel, nwoke ahụ m hụrụ nʼọhụ na mbụ, feere ọsịịsọ bịakwute m nʼoge a na-achụ aja nke uhuruchi. 22Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta. 23Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a. 24“Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ* mmanụ. 25“Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.