Daniel 9:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu.
Daniel 9:18 in English
Daniel 9:18 · Berean Standard Bible
Incline Your ear, O my God, and hear; open Your eyes and see the desolation of the city that bears Your name. For we are not presenting our petitions before You because of our righteous acts, but because of Your great compassion.
Context
16Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu. 17“Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu. 18Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu. 19Onyenwe anyị nụrụ! Onyenwe anyị, gbaghara anyị! Onyenwe anyị biko, gee ntị ma zaa anyị. Nʼihi aha gị, O Chineke m, anọkwala ọdụ, nʼihi obodo gị, na ndị nke gị bụ aha gị ka a na-akpọ ha.” 20Mgbe m nọ na-ekwu okwu na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị m Izrel, na-arịọkwa amara nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke m maka ugwu dị nsọ nke Chineke m,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.