Daniel 8:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ
Daniel 8:9 in English
Daniel 8:9 · Berean Standard Bible
From one of these horns a little horn emerged and grew extensively toward the south and the east and toward the Beautiful Land.
Context
7Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya. 8Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe, 9Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ 10O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha. 11O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.