Daniel 8:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha.
Daniel 8:10 in English
Daniel 8:10 · Berean Standard Bible
It grew as high as the host of heaven, and it cast down some of the host and some of the stars to the earth, and trampled them.
Context
8Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe, 9Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ 10O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha. 11O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala. 12Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ* na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.