Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’

Daniel 7:27 in English

Daniel 7:27 · Berean Standard Bible

Then the sovereignty, dominion, and greatness of the kingdoms under all of heaven will be given to the people, the saints of the Most High. His kingdom will be an everlasting kingdom, and all rulers will serve and obey Him.’

Context

25Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara. 26“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam. 27Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’ 28“Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.” 7:8 Ya bụ, nyakapụ 7:8 Ime ka mpi ntakịrị a nweta ohere ebe ọ ga-esi pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.