Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.

Daniel 7:26 in English

Daniel 7:26 · Berean Standard Bible

But the court will convene, and his dominion will be taken away and completely destroyed forever.

Context

24Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi. 25Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara. 26“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam. 27Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’ 28“Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.” 7:8 Ya bụ, nyakapụ 7:8 Ime ka mpi ntakịrị a nweta ohere ebe ọ ga-esi pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.