Daniel 7:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa.
Daniel 7:17 in English
Daniel 7:17 · Berean Standard Bible
‘These four great beasts are four kings who will arise from the earth.
Context
15“Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji. 16Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara.
“Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara. 17‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa. 18Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’ 19“Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.