Daniel 5:31
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.
Daniel 5:31 in English
Daniel 5:31 · Berean Standard Bible
and Darius the Mede received the kingdom at the age of sixty-two.
Context
29Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ. 30Nʼabalị ụbọchị ahụ kwa ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldịa. 31Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.