Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a.

Daniel 5:24 in English

Daniel 5:24 · Berean Standard Bible

Therefore He sent the hand that wrote the inscription.

Context

22“Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile. 23Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ. 24Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a. 25“Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin 26“Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.