Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ.

Daniel 5:10 in English

Daniel 5:10 · Berean Standard Bible

Hearing the outcry of the king and his nobles, the queen * entered the banquet hall. “O king, may you live forever!” she said. “Do not let your thoughts terrify you, or your face grow pale.

Context

8Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara. 9Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị. 10Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ. 11Nʼihi na o nwere otu nwoke nọ nʼalaeze gị, onye mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ bi nʼime ya. Nʼoge ahụ nna gị bụ eze, a chọpụtara na nwoke a jupụtara nʼamamihe na nghọta, dịka a ga-asị na ya onwe ya bụ chi. Nna gị eze Nebukadneza mere ya onyeisi ndị amamihe niile, ndị dibịa, ndị na-enyocha kpakpando, ndị Kaldịa na ndị mgba afa niile. 12Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.