Daniel 4:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Daniel 4:3 in English
Daniel 4:3 · Berean Standard Bible
How great are His signs, how mighty His wonders! His kingdom is an eternal kingdom; His dominion endures from generation to generation.
Context
1Mụ bụ Nebukadneza,
Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi:
Ka ọ dịrị unu na mma! 2E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m. 3Lee ka ihe ịrịbama ya,
na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu!
Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi;
ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 4Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m. 5Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.