Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze.

Daniel 4:24 in English

Daniel 4:24 · Berean Standard Bible

This is the interpretation, O king, and this is the decree that the Most High has issued against my lord the king:

Context

22osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa. 23“Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’ 24“Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze. 25A ga-achụpụ gị site nʼebe ndị mmadụ nọ. A ga-achụgakwa gị nʼebe gị na ụmụ anụmanụ ga-ebi nʼọhịa, Ebe ahụ ka ị ga-anọ taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe ga-ezokwasịkwa gị. Ọnụọgụgụ afọ asaa ga-agabiga tutu ruo mgbe ị nabatara na Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke mmadụ, na ọ bụkwa nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-enyefe ha. 26Dịka e siri nye nʼiwu ka a hapụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya nʼime ala. Nke a na-egosi na ị ga-emecha nwetaghachi alaeze gị mgbe ị nabatara na Eluigwe na-achị achị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.