Daniel 4:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’
Daniel 4:23 in English
Daniel 4:23 · Berean Standard Bible
And you, O king, saw a watcher, a holy one, coming down from heaven and saying: ‘Cut down the tree and destroy it, but leave the stump with its roots in the ground, and a band of iron and bronze around it, in the tender grass of the field. Let him be drenched with the dew of heaven, and graze with the beasts of the field till seven times pass him by.’
Context
21nke nwekwara akwụkwọ ndụ dị mma, na nke jupụtara na mkpụrụ, nke na-egboro mmadụ niile mkpa nri, nke ụmụ anụmanụ ọhịa niile na-ebi nʼokpuru ndo ya, nke ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe nwere akwụ ebe obibi ha, 22osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa. 23“Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’ 24“Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze. 25A ga-achụpụ gị site nʼebe ndị mmadụ nọ. A ga-achụgakwa gị nʼebe gị na ụmụ anụmanụ ga-ebi nʼọhịa, Ebe ahụ ka ị ga-anọ taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe ga-ezokwasịkwa gị. Ọnụọgụgụ afọ asaa ga-agabiga tutu ruo mgbe ị nabatara na Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke mmadụ, na ọ bụkwa nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-enyefe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.