Daniel 4:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’
Daniel 4:17 in English
Daniel 4:17 · Berean Standard Bible
This decision is the decree of the watchers, the verdict declared by the holy ones, so that the living will know that the Most High rules over the kingdom of mankind and gives it to whom He wishes, setting over it the lowliest of men.’
Context
15Kama hapụnụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya ka ha dịrị nʼime ala, ebe e ji ụdọ igwe na ụdọ bronz kee ya gburugburu, ebe ahịhịa ndụ gbakwara ya gburugburu.
“ ‘Ka igirigi nke eluigwe zoo ya nʼahụ, ka ahịhịa bụrụkwa nri ọ ga-eri, ya na ụmụ anụmanụ. 16Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa. 17“ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’ 18“Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.” 19Mgbe ahụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), nọ nʼoke ihe iju anya nʼihi na echiche ya mere ka ọma jijiji. Ya mere, eze sịrị, “Belteshaza, atụkwala egwu nʼihi nrọ a maọbụ ihe ọ pụtara.”
Belteshaza zara sị, “Onyenwe m, ka nrọ a dịrị ndị kpọrọ gị asị, ka nkọwa ya dịkwara ndị iro gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.