Daniel 4:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa.
Daniel 4:16 in English
Daniel 4:16 · Berean Standard Bible
Let his mind be changed from that of a man, and let him be given the mind of a beast till seven times pass him by.
Context
14O tiri mkpu nʼolu dị ike sị, ‘Gbudanụ osisi ukwu ahụ, gbukasịakwa alaka ya niile. Kụpụsịanụ akwụkwọ ndụ niile dị nʼelu ya. Ghasaakwanụ mkpụrụ ya niile, ka ụmụ anụmanụ si nʼokpuru ndo ya gbapụ, ka ụmụ nnụnụ site nʼalaka ya fepụ. 15Kama hapụnụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya ka ha dịrị nʼime ala, ebe e ji ụdọ igwe na ụdọ bronz kee ya gburugburu, ebe ahịhịa ndụ gbakwara ya gburugburu.
“ ‘Ka igirigi nke eluigwe zoo ya nʼahụ, ka ahịhịa bụrụkwa nri ọ ga-eri, ya na ụmụ anụmanụ. 16Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa. 17“ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’ 18“Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.